6 “Sinụ n’ime Babịlọn gbapụ,+ onye ọ bụla n’ime unu meere mkpụrụ obi ya ụzọ mgbapụ.+ Ka njehie ya ghara igbu unu.+ N’ihi na ọ bụ oge ịbọ ọbọ Jehova.+ Ọ ga-akwụ ya ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị.+
11 Pịanụ akụ́ unu.+ Burunụ ọta okirikiri unu. Jehova akpaliwo mmụọ nke ndị eze ndị Midia,+ n’ihi na o bu n’obi imegide Babịlọn,+ iji laa ya n’iyi. N’ihi na ọ bụ ịbọ ọbọ Jehova, bụ́ ọbọ ọ ga-abọ n’ihi ụlọ nsọ ya.+