11 “Ugbu a, biko, gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m na-akwadebere unu ọdachi, na-echekwa echiche ime unu ihe.+ Biko, onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya, meekwanụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma.”’”+
13 Ma ugbu a, meenụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma,+ rubekwanụ isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke unu kwuru, Jehova ga-agbanwekwa obi ya n’ọdachi ahụ o kwuru ga-adakwasị unu.+