7 Olee otú m ga-esi gbaghara gị ihe a? Ụmụ gị ahapụwo m, ha na-ejikwa ihe na-abụghị Chi+ aṅụ iyi.+ M nọ na-eme ka afọ ju ha,+ ma ha nọ na-akwa iko,+ ọ bụ n’ụlọ nwaanyị akwụna ka ha na-aga n’ìgwè n’ìgwè.
10 N’ihi na ndị na-akwa iko+ juru n’ala a.+ N’ihi na ala a na-eru uju n’ihi ọbụbụ ọnụ,+ ahịhịa dị n’ala ịta ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa akpọnwụwo;+ omume ha dị njọ, ike ha na-akpa ezighịkwa ezi.
4 Ha niile bụ ndị na-akwa iko.+ Ha dị ka ekwú ọkụ nke onye na-eme achịcha menwuru ọkụ, nke ọ na-akwụsị ịkwanye ọkụ mgbe ọ gwọchara ntụ ọka,* ruo mgbe o koro eko.