Hosia
7 “N’oge m ga-agwọ Izrel,+ a ga-ekpughe njehie Ifrem,+ kpugheekwa ihe ọjọọ Sameria mere;+ n’ihi na ha anọwo na-aghọ aghụghọ,+ onye ohi na-abatakwa; ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga na-awakpo ndị mmadụ n’èzí.+ 2 Obi ha adịghị agwa ha+ na m ga-echeta ihe ọjọọ niile ha na-eme.+ Ugbu a, omume ha agbawo ha gburugburu.+ Ọ dị n’ihu m.+ 3 Ha ji ihe ọjọọ ha na-eme ka eze ṅụrịa, ha jikwa aghụghọ ha na-eme ka ndị isi ṅụrịa ọṅụ.+ 4 Ha niile bụ ndị na-akwa iko.+ Ha dị ka ekwú ọkụ nke onye na-eme achịcha menwuru ọkụ, nke ọ na-akwụsị ịkwanye ọkụ mgbe ọ gwọchara ntụ ọka,* ruo mgbe o koro eko. 5 N’ụbọchị eze anyị, ndị isi akpataworo onwe ha ọrịa+, mmanya akpataworo ha ọnụma.+ O setịpụworo ndị na-akwa emo aka ya. 6 N’ihi na ha emewo ka obi ha dị ka ihe e debere n’akụkụ ekwú ọkụ;+ ọ na-ere ọkụ n’ime ha.+ N’abalị dum, onye na-emere ha achịcha na-ehi ụra; n’ụtụtụ, ekwú ọkụ ha na-enwusi ọkụ ike.+ 7 Ha niile dị ọkụ dị ka ekwú ọkụ, ha na-erepịakwa ndị ikpe ha. Ndị eze ha niile adawo;+ ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha na-akpọku m.+
8 “Ifrem na ndị dị iche iche na-emekọ ihe.+ Ifrem aghọwo achịcha a na-atụgharịghị azụ ya atụgharị.+ 9 Ndị ala ọzọ erichapụwo ike ya,+ ya onwe ya amaghịkwa.+ Isi achawokwa ya awọ́, ma ya onwe ya amaghị. 10 Ihe Izrel ji anya isi agbagidewo ya akaebe,+ ma ha alaghachikwurughị Jehova bụ́ Chineke ha,+ ihe a dum emeghịkwa ka ha chọọ ya.+ 11 Ifrem dị ka nduru dị nzuzu+ nke na-enweghị uche.+ Ha akpọkuwo Ijipt;+ ha agakwuruwo Asiria.+
12 “N’ebe ọ bụla ha na-aga, m ga-eji ụgbụ m jide ha.+ M ga-adọdata ha+ dị ka anụ ufe nke eluigwe. M ga-ata ha ahụhụ dị ka ihe a gwara nzukọ ha si dị.+ 13 Ahụhụ ga-adịrị ha,+ n’ihi na ha agbapụwo n’ebe m nọ!+ A ga-ebukọrọ ihe niile ha nwere, n’ihi na ha emehiewo m! Abụ m onye mgbapụta ha,+ ma ha onwe ha aghagidewo m ụgha.+ 14 Ha ejighị obi ha kpọkuo m maka enyemaka,+ ọ bụ ezie na ha na-eti mkpu n’ihe ndina ha. Nri ha na mmanya ha dị ụtọ na-eme ka ha nọrọ nkịtị;+ ha na-atụgharị megide m.+ 15 Ma mụ onwe m dọrọ ha aka ná ntị;+ m mere ka ogwe aka ha dị ike,+ ma, ọ bụ m ka ha na-akpara nkata ọjọọ.+ 16 Ha wee lọghachi, ma ha alọghachighị n’ezi ofufe;+ ha dị ka ụta a na-ekwesighị ike.+ A ga-eji mma agha gbuo ndị isi ha n’ihi nkatọ ire ha katọrọ.+ Nke a ga-abụ emo a ga-akwa ha n’ala Ijipt.”+