6 Eze Izrel wee kpọkọta+ ndị amụma, ihe dị ka narị ndị ikom anọ, wee sị ha: “Ọ̀ bụ m gaa buso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ mụ agala?” Ha wee na-asị: “Gawa,+ Jehova ga-enyefekwa ya n’aka eze.”
32 Ọ bụ ezie na ndị a maara iwu ezi omume nke Chineke nke ọma,+ na ndị na-eme ihe ndị dị otú a kwesịrị ọnwụ,+ ọ bụghị naanị na ha na-eme ha, kamakwa ha na-ekwenyere+ ndị na-eme ha.