13 Jehova wee sị: “Ebe ọ bụ na ọ bụ n’ọnụ ka ndị a bịakwuteworo m, ọ bụkwa naanị egbugbere ọnụ ha ka ha ji nye m otuto,+ ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe m nọ,+ egwu ha na-atụ m bụkwa ihe mmadụ nyere n’iwu nke a na-akụziri ha,+
10 n’agbanyeghị ihe a dum, nwanne ya nwaanyị nke na-aghọ aghụghọ bụ́ Juda ejighị obi ya dum lọghachikwute m,+ kama o ji aghụghọ lọghachikwute m,’+ ka Jehova kwuru.”
5 “Gwa ndị niile bi n’ala a na ndị nchụàjà, sị, ‘Mgbe unu buru ọnụ+ ma kwaa ákwá arịrị n’ọnwa nke ise nakwa n’ọnwa nke asaa,+ meekwa ya ruo afọ iri asaa,+ ọ̀ bụ m n’ezie ka unu buuru ya?+