26 Ada bụ́ ndị m, kee ákwà iru uju n’úkwù,+ tụrụọkwa onwe gị ná ntụ.+ Ruo uju dị ka nke a na-eruru nwa a mụrụ naanị ya ma ọ nwụọ, bụ́ mkpu arịrị e ji obi ilu na-eti;+ n’ihi na onye na-ebukọrọ ihe mmadụ ga-abịakwasị anyị na mberede.+
17 “Gwa ha, sị: ‘Ka anya mmiri na-agbapụta m n’anya n’akwụsịghị akwụsị abalị na ehihie,+ n’ihi na ada na-amaghị nwoke bụ́ ndị m adawo ajọ ọdịda wee gbajie ọkpụkpụ,+ ahụ́ o merụrụ dị oké njọ.+