6 “M bipụrụ mba dị iche iche; m mekwara ka ụlọ nche ndị dị na nkuku mgbidi ha tọgbọrọ n’efu. M lara okporo ámá ha n’iyi, nke mere na o nweghị onye na-esi na ya agafe. E mere ka obodo ha bụrụ mkpọmkpọ ebe, nke mere na mmadụ afọdụghị, ọ dịghịkwa onye bi na ha.+