13 Jehova, olileanya Izrel,+ ihere ga-eme ndị niile hapụrụ gị.+ Ndị si n’ife m ofufe dapụ,+ a ga-ede aha ha n’ájá, n’ihi na ha ahapụwo isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, bụ́ Jehova.+
7 Ndị niile hụrụ ha eripịawo ha,+ ndị iro ha asịwo,+ ‘Ikpe agaghị ama anyị,+ n’ihi na ha emehiewo Jehova bụ́ ebe obibi nke ezi omume+ na olileanya nke ndị nna nna ha,+ bụ́ Jehova.’”