14 N’ihi na ha onwe ha, ya bụ, ọtụtụ mba na ndị eze ukwu,+ erigbuwo ha dị ka ndị ohu;+ m ga-akwụ ha ụgwọ dị ka ihe ha mere si dị nakwa dị ka ọrụ aka ha si dị.’”+
19 Ijipt ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu;+ Idọm ga-aghọkwa ala ịkpa nke tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi ihe ike ha mesoro ụmụ Juda, bụ́ ndị ha nọ n’ala ha wụfuo ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.+