2 Ndị dị iche iche ga-akpọrọ ha kpọbata n’obodo nke ha, ụlọ Izrel ga-akpọrọkwa ha ịbụ ihe nketa ha n’ala Jehova ka ha wee bụrụ ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi;+ ndị dọọrọ ha n’agha ka ha ga-adọrọkwa n’agha,+ ndị na-amanyebu ha ịrụ ọrụ ga-anọzi n’okpuru ha.+
7 Babịlọn bụ iko ọlaedo Jehova bu n’aka,+ nke na-eme ka mmanya gbuwe mba dị iche iche.+ Mba dị iche iche aṅụwo mmanya dị n’ime ya.+ Ọ bụ ya mere mba dị iche iche ji na-eme ara ara.+
8 Ebe ọ bụ na i bukọọrọ ihe ọtụtụ mba, ndị niile fọdụrụ ná mba ndị ahụ ga-ebukọrọ ihe gị,+ n’ihi ọbara ndị mmadụ ị wụfuru nakwa n’ihi ihe ike i mesoro elu ala, obodo ahụ na ndị niile bi n’ime ya.+