24 Ha ga-eji ụgbọ ịnyịnya agha na ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha ndị na-eme mkpọtụ bata buso gị agha,+ ha na ìgwè ndị dị iche iche. Ha ga-ejikwa ọta ukwu na ọta nta na okpu agha. Ha ga-agba gị gburugburu imegide gị, m ga-enyefekwa ikpe n’aka ha, ha ga-ekpekwa gị ikpe dị ka mkpebi ha si dị.+