3 Mgbe ha ga-anụ ụda ụkwụ oké ịnyịnya ya,+ nụkwa mkpọtụ ụgbọ ịnyịnya agha ya,+ bụ́ oké ụzụ nke ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ya na-eme,+ ndị nna agaghị ele anya n’azụ ịkpọrọ ụmụ ha, n’ihi na aka ha akụdawo,
10 N’ihi ọsọ ịnyịnya ya na-awụ, uzuzu ha ga-ekpuchi gị.+ N’ihi mkpọtụ nke onye agha ịnyịnya na ụkwụ ụgbọ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha na-eme, mgbidi gị ga-ama jijiji, mgbe o si n’ọnụ ụzọ ámá gị na-abata, dị ka mgbe a batara n’obodo nke a kwaturu mgbidi ya.