13 N’ihi na ọ sịwo, ‘M ga-eji aka m dị ike na amamihe m mee ihe,+ n’ihi na m nwere nghọta; m ga-ewepụ ókèala nke ndị dị iche iche,+ m ga-akwakọrọkwa ihe ha kpakọbara,+ dị ka onye dị ike ka m ga-akwada ndị bi n’ime ya.+
23 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ka onye maara ihe ghara iji amamihe ya na-anya isi,+ ka dike ghara iji ike ya na-anya isi.+ Ka ọgaranya ghara iji akụnụba ya na-anya isi.”+