13 N’ihi na ọ sịwo, ‘M ga-eji aka m dị ike na amamihe m mee ihe,+ n’ihi na m nwere nghọta; m ga-ewepụ ókèala nke ndị dị iche iche,+ m ga-akwakọrọkwa ihe ha kpakọbara,+ dị ka onye dị ike ka m ga-akwada ndị bi n’ime ya.+
9 Ala Ijipt ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu na ebe a lara n’iyi;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova, ebe ọ bụ na ọ sịrị, ‘Ọ bụ m nwe Osimiri Naịl, ọ bụkwa m mere ya.’+