7 Ebe dị iche iche mmiri na-adịghị n’akụkụ Osimiri Naịl, n’ọnụ Osimiri Naịl, tinyere ala dum a kụrụ mkpụrụ n’akụkụ Osimiri Naịl, ga-akpọ nkụ.+ Ifufe ga-efesasị ihe a kụrụ na ha, ha agaghị adịkwa.
12 M ga-eme ka ọwa mmiri niile nke Naịl+ bụrụ ala akọrọ, werekwa ala ha resị ndị ọjọọ.+ M ga-ejikwa ndị mba ọzọ mee ka ala ha na ihe niile dị n’ime ya tọgbọrọ n’efu.+ Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya.’+