18 “‘Ònye ka i yiri n’ebube+ nakwa n’ịdị ukwuu n’etiti osisi ndị dị n’Iden?+ Ma a ga-egbutu gị na osisi ndị dị n’Iden, unu ewee banye n’ime ala.+ N’etiti ndị a na-ebighị úgwù ka gị na ndị e ji mma agha gbuo ga-atọgbọ. Nke a bụ Fero na ndị ya niile,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”