10 Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Lee, m ga-ezi ozi, m ga-akpọrọ Nebukadreza eze Babịlọn,+ bụ́ ohu m,+ m ga-edebe ocheeze ya kpọmkwem n’elu nkume ndị a m zoro, ọ ga-agbasakwa ụlọikwuu ọma ya n’elu ha.
26 “‘M ga-enyefe ha n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi ha nakwa n’aka Nebukadreza eze Babịlọn+ nakwa n’aka ndị na-ejere ya ozi; e mesịa, a ga-ebirighachi n’Ijipt dị ka ọ dị n’oge ochie,’+ ka Jehova kwuru.
24 M ga-eme ka ogwe aka eze Babịlọn dị ike,+ m ga-enyekwa ya mma agha m.+ M ga-agbajikwa ogwe aka Fero, dị ka onye e merụrụ ahụ́ nke ukwuu, ọ ga-asụ ude nke ukwuu n’ihu ya.+