30 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-enyefe Fero Họfra, bụ́ eze Ijipt,+ n’aka ndị iro ya nakwa n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi ya,+ dị nnọọ ka m nyefere Zedekaya eze Juda n’aka Nebukadreza eze Babịlọn, bụ́ onye iro ya na onye na-achọ mkpụrụ obi ya.”’”+