16 Mgbe a nụrụ ụda ọdịda ya, m ga-eme ka mba niile maa jijiji mgbe m ga-eme ka ọ gbadaa Shiol, ya na ndị na-agbada n’olulu.+ N’ime ala ka a ga-akasi ha obi,+ ya bụ, osisi niile nke Iden,+ ezigbo osisi Lebanọn ndị a na-achọsi ike, osisi niile na-amịta mmiri nke ọma.