21 “Gaanụ jụọ Jehova ase+ n’aha m+ nakwa n’aha ihe fọdụrụ n’Izrel nakwa na Juda banyere ihe e kwuru n’akwụkwọ a+ a hụrụ, n’ihi na ọnụma Jehova+ nke ọ ga-awụkwasị anyị dị ukwuu n’ihi na nna nna anyị hà emeghị ihe Jehova kwuru, ha emeghị ihe niile e dere n’akwụkwọ a.”+
25 O wee na-awụkwasị ya ọnụma ya na iwe ya, meekwa ka agha kpaa ya aka ọjọọ.+ O wee na-ere ya ka ọkụ n’akụkụ niile,+ ma ọ maghị;+ ọ nọkwa na-ere ka ọkụ megide ya, ma o tinyeghị ya n’obi.+