6 M wee sị:+ “Chineke m, ihere+ na-eme m, ahụ́ erughịkwa m ala+ iwelite ihu m lee anya n’ebe ị nọ, Chineke m, n’ihi na njehie+ anyị dị ọtụtụ, ikpe ọmụma anyị adịwokwa ukwuu ruo ọbụna n’eluigwe.+
26 “Otú ọ dị, ha ghọrọ ndị nnupụisi+ wee meere gị isi ike+ ma na-eleghara iwu gị anya,+ ha gbukwara ndị amụma gị,+ bụ́ ndị gbara àmà megide ha iji mee ka ha laghachikwute gị;+ ha wee na-eme omume nlelị dị ukwuu.+
18 “Anụwo m ka Ifrem na-akwa ákwá arịrị,+ sị, ‘Ị gbaziwo m, ka m wee bụrụ onye a gbaziri agbazi,+ dị ka nwa ehi a na-azụghị azụ.+ Kpọghachite m, m ga-alọghachikwa,+ n’ihi na ị bụ Jehova bụ́ Chineke m.+