2 N’ihi na ha alụrụwo ụfọdụ n’ime ndị inyom ha, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom;+ ha onwe ha kwa, bụ́ mkpụrụ dị nsọ,+ na ndị ala a na-emekọkwa ihe,+ ọ bụkwa ndị isi na ndị osote onye na-achị achị bu omume ekwesịghị ntụkwasị obi a n’isi.”+
18 “Bịanụ ka anyị kpezie,” ka Jehova kwuru.+ “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha;+ ọ bụrụgodị na ọ na-acha ọbara ọbara dị ka ákwà uhie, ọ ga-adị ka ajị ọcha.