5 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Gịnị bụ ihe na-ezighị ezi nna unu hà hụrụ n’ebe m nọ+ nke mere ha ji nọrọ m n’ebe dị anya,+ ha wee na-eso arụsị na-abaghị uru,+ ha onwe ha wee ghọọ ndị na-abaghị uru?+
2 Nụrụnụ okwu ikpe Jehova, unu ugwu niile, nụrụkwanụ, unu ihe ndị na-adịte anya, unu ntọala ụwa;+ n’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu ikpe, ọ bụkwa ya na Izrel ga-arụrịta ụka:+