3 N’ihi na, “lee! oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-achịkọta ndị m a dọọrọ n’agha, bụ́ Izrel na Juda,”+ ka Jehova kwuru, “m ga-akpọlata ha n’ala m nyere ndị nna nna ha, ha ga-ebirighachi na ya.”’”+
25 “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Mgbe m ga-akpọkọta ụlọ Izrel site n’etiti ndị dị iche iche bụ́ ebe a chụsasịrị ha,+ a ga-edokwa m nsọ n’etiti ha n’ihu mba dị iche iche.+ Ha ga-anọkwa n’ala ha+ nke m nyere ohu m Jekọb.+