5 O wee gwa Kora na ndị niile ya na ha zukọtara, sị: “N’ụtụtụ, Jehova ga-eme ka a mara onye bụ́ nke ya+ na onye dị nsọ+ na onye ga na-abịa ya nso,+ onye ọ bụla ọ họọrọ+ ga na-abịa ya nso.
5 “Ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị ga-abịarukwa nso, n’ihi na ọ bụ ha ka Jehova bụ́ Chineke gị họọrọ ka ha na-ejere ya ozi+ nakwa ka ha jiri aha Jehova na-agọzi ndị mmadụ,+ ọ bụkwa ọnụ ha ga-ekpe ikpe esemokwu ọ bụla metụtara ime ihe ike ọ bụla.+
46 Ụlọ iri ihe nke chere ihu n’ebe ugwu bụ maka ndị nchụàjà bụ́ ndị na-arụ ọrụ a na-arụ n’ebe ịchụàjà.+ Ha bụ ụmụ Zedọk,+ ndị si n’agbụrụ Livaị, ndị na-abịaru Jehova nso ijere ya ozi.”+