9 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘O zuolara unu, unu ndị isi Izrel!’+
“‘Kwụsịnụ ime ihe ike na ibukọrọ ihe ndị mmadụ,+ kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume.+ Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.
3 N’ihi na oge+ gafere agafe ezuworo unu ịrụzu ihe ndị mba ọzọ na-achọ,+ mgbe unu jere ije n’omume rụrụ arụ,+ n’agụụ ihe ọjọọ, n’ịṅụ oké mmanya,+ n’oriri oké mkpọtụ, n’ịma aka n’ịṅụ mmanya, na n’ikpere arụsị jọgburu onwe ya.+