2 “Gwa Erọn na ụmụ ya ka ha ghara imetụ ihe ndị dị nsọ ụmụ Izrel na-eweta aka, wee ghara imerụ aha m dị nsọ+ n’ihe ndị ha na-edoro m nsọ.+ Abụ m Jehova.
3 Ha ga na-arụ ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ gị na ọrụ ha kwesịrị ịrụ n’ụlọikwuu ahụ dum.+ Ọ bụ naanị na ha agaghị abịaru arịa ndị dị n’ebe nsọ ahụ nso, ha agaghịkwa abịa nso n’ebe ịchụàjà ahụ ka ha ghara ịnwụ,+ ma ha ma unu onwe unu.