20 Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.+ Nwata agaghị aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nna ya, nna agaghịkwa aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nwa ya.+ Ezi omume nke onye ezi omume ga-adị n’isi ya,+ ajọ omume nke onye ajọ omume ga-adịkwa n’isi ya.+
12 Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume;+ jirinụ obiọma* ghọọ mkpụrụ.+ Kọọnụ ala ubi unu,+ mgbe oge ka dị ịchọ Jehova ruo mgbe ọ ga-abịa+ nye unu ntụziaka n’ezi omume.+
3 chọọnụ Jehova,+ unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa,+ ndị meworo ihe o kpere n’ikpe. Chọọnụ ezi omume,+ chọọnụ ịdị umeala n’obi.+ Ma eleghị anya,+ a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.+