11 Ndị isi ya anaghị ekpe ikpe ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ngarị,+ ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ,+ ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego;+ ma n’ebe Jehova nọ ka ha dabeere, na-asị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị n’etiti anyị?+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+
11 N’ụbọchị ahụ, ihere agaghị eme gị n’ihi mmehie niile i mere megide m,+ n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka m ga-ewepụ ndị gị dị mpako n’etiti gị;+ ị gakwaghị adị mpako n’ugwu nsọ m.+