5 Jehoyakim+ gbara afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri na otu na Jeruselem.+ O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.+
17 ‘Anya gị na obi gị dị naanị n’uru na-ezighị ezi,+ dịrịkwa n’ọbara onye aka ya dị ọcha ka ị wụfuo ya,+ dịrịkwa n’irigbu ndị mmadụ nakwa n’ịpụnara ha ihe ka i wee na-eme ihe ndị a.’