-
Daniel 5:21Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
21 A chụpụkwara ya n’etiti ụmụ mmadụ, mee ka obi ya dịrị ka nke anụ ọhịa, ya na ịnyịnya ibu ọhịa wee biri.+ E nyere ya ahịhịa ka ọ na-ata dị ka ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ́ ya,+ ruo mgbe ọ matara na Chineke bụ́ Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ nakwa na ọ bụ onye ọ chọrọ ka ọ chịa ka ọ na-eme ka ọ chịa.+
-