8 M nọ na-eche banyere mpi ndị ahụ, ma, lee! mpi ọzọ, nke dị ntakịrị,+ pulitere n’etiti ha, e fopụkwara atọ n’ime mpi ndị mbụ ahụ n’ihu ya. Ma, lee! e nwere anya ndị yiri anya mmadụ na mpi a, e nwekwara ọnụ nke na-etu ọnụ.+
20 nakwa banyere mpi iri ahụ dị ya n’isi,+ na mpi nke ọzọ+ ahụ puliterenụ, nke mpi atọ dara n’ihu ya,+ ya bụ, mpi ahụ nke nwere anya, nweekwa ọnụ na-etu ọnụ,+ o bukwara ibu karịa ndị ibe ya.