25 N’ihi nghọta o nwere, ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịghọ aghụghọ.+ Ọ ga-ebulikwa onwe ya elu n’obi ya,+ ọ ga-alakwa ọtụtụ ndị n’iyi n’oge nchegbu na-adịghị.+ Ọ ga-ebilikwa megide Onyeisi nke ndị isi,+ ma ọ bụghị aka ka a ga-eji gbajie ya.+
4 Ọ bụ onye mmegide,+ ọ na-ebulikwa onwe ya ka ọ dị elu karịa onye ọ bụla a na-akpọ “chi” ma ọ bụ ihe a na-efe ofufe. O wee nọdụ ala n’ụlọ nsọ nke Chineke, na-egosi n’ihu ọha na ya bụ chi.+