25 Ọ ga-ekwu okwu ọbụna megide Onye Kasị Elu,+ ọ ga na-enyekwa ndị nsọ nke Onye Kasị Elu nsogbu.+ Ọ ga-achọ ịgbanwe oge+ na iwu,+ a ga-enyefekwa ha n’aka ya ruo otu oge, oge abụọ na ọkara otu oge.+
2 Ma hapụ ogige nke dị n’èzí+ ebe nsọ nke ụlọ nsọ ahụ kpamkpam, atụkwala ya atụ̀, n’ihi na e nyewo ya ndị mba ọzọ,+ ha ga-azọkwasịkwa obodo nsọ+ ahụ ụkwụ ruo ọnwa iri anọ na abụọ.+
6 Nwaanyị ahụ wee gbaga n’ala ịkpa,+ bụ́ ebe o nwere ebe Chineke kwadebere, ka ha wee na-enye ya nri+ n’ebe ahụ ruo otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii.+
14 Ma e nyere nwaanyị ahụ nku abụọ nke nnukwu ugo,+ ka o wee fega n’ala ịkpa,+ bụ́ ebe a kwadebeere ya; n’ebe ahụ ka e nyere ya nri+ ruo otu oge na oge abụọ na ọkara otu oge+ n’ebe agwọ ahụ na-anọghị.+