11 Ndị isi ya anaghị ekpe ikpe ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ngarị,+ ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ,+ ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego;+ ma n’ebe Jehova nọ ka ha dabeere, na-asị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị n’etiti anyị?+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+
3 Aka ha dị n’ihe ọjọọ, imeta ya nke ọma;+ onyeisi na-ekwu ka e nye ya ihe, onye na-ekpe ikpe na-ekpekwa ikpe iji nata ụgwọ ọrụ,+ onye ukwu na-ekwukwa ihe si ya n’obi, uche nke aka ya;+ ha na-agbakọ aka eme ya.