2 Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+
15 O jiriwo nko azụ̀ dọpụta ha niile;+ ọ na-eji ụgbụ ya adọkpụrụ ha, ọ na-achịkọtakwa ha n’ụgbụ o ji akụ azụ̀.+ Ọ bụ ya mere o ji na-aṅụrị ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ.+