4 Aha ha bụ Ohola, bụ́ nke okenye, na Oholiba nwanne ya nwaanyị, ha wee bụrụ nke m+ ma malite ịmụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.+ A bịa n’aha ha, Ohola bụ Sameria,+ Oholiba bụ Jeruselem.+
11 “Mgbe nwanne ya nwaanyị bụ́ Oholiba hụrụ ihe ọ na-eme,+ ya onwe ya ji ọchịchọ anụ ahụ́ ya mee omume na-eweta mbibi karịa nwanne ya nwaanyị. Ọ gbara akwụna karịa ịkwa iko nke nwanne ya nwaanyị.+