23 n’ihi na nnupụisi+ na mmehie nke ịgba afa+ bụ otu ihe, iji mpako na-ebute ụzọ n’ihe na iji ike anwansi na terafim eme ihe bụ otu ihe.+ Ebe ọ bụ na ị jụwo okwu Jehova,+ ya onwe ya ajụwo gị ka ị ghara ịbụkwa eze.”+
21 “‘“Ụmụ ha wee malite inupụrụ m isi.+ Ha ejeghị ije n’ụkpụrụ m, ha edebeghịkwa mkpebi ikpe m site n’ime ya eme, bụ́ nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ma ọ bụrụ na o debe ya.+ Ha merụrụ ụbọchị izu ike m.+ M wee kwuo na m ga-awụkwasị ha ọnụma m, ka m wee wụkwasị ha iwe m dum n’ala ịkpa.+