14 Igurube wee malite ifebata n’ala Ijipt dum wee jupụta n’ókèala Ijipt dum.+ Ha nyere oké nsogbu.+ Tupu ha abịa, e nwetụbeghị igurube bịara otú a ha ji bịa, ọ dịghịkwa mgbe a ga-enwe nke ọ bụla ga-abịa otú a mgbe ha lasịrị.
14 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na nwa gị mesịa jụọ gị,+ sị, ‘Gịnị ka ihe a pụtara?’ ị ga-asị ya, ‘Jehova ji ike aka ya kpọpụta anyị n’Ijipt,+ n’ụlọ ndị ohu.+
7 kụnye ha n’ime ụmụ gị,+ kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala+ nakwa mgbe i biliri ọtọ.
22 “Ọgbọ nke dị n’ihu, bụ́ ụmụ unu ndị ga-anọchi unu, na onye mba ọzọ nke ga-esi n’ala dị anya bịa, ga-asị, mgbe ha hụrụ ihe otiti nke ala ahụ na nrịanrịa ya ndị Jehova ji sogbuo ya,+