32 Jeroboam wee mee ememme n’ọnwa nke asatọ n’abalị iri na ise n’ọnwa, dị ka ememme a na-eme na Juda,+ ka o wee chụọ àjà n’elu ebe ịchụàjà nke ọ rụrụ na Betel, ịchụrụ nwa ehi ndị ahụ o mere àjà; o wee debe ndị nchụàjà nke ebe ndị dị elu ndị ọ rụrụ ka ha na-eje ozi na Betel.+
33 Mgbe ihe a mesịrị, Jeroboam ahapụghị ụzọ ọjọọ ya, kama ọ malitere ọzọ isi ná ndị nkịtị na-ahọrọ ndị ọ na-eme ndị nchụàjà nke ebe ndị dị elu.+ Onye chọọ, ya enye ya ikike,+ sị: “Ka ọ ghọọ otu n’ime ndị nchụàjà nke ebe ndị dị elu.”