7 Ọ pụtawo dị ka ọdụm nke si n’obere ọhịa ọ nọ pụta,+ onye ahụ nke na-ebibi mba dị iche iche amalitewo njem;+ o siwo n’obodo ya bilie ka o mee ka ala gị bụrụ ihe ijuanya. Obodo gị niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe nke na ọ dịghị onye ga-ebi na ha.+
“Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ,+ ọ ga-esikwa na Jeruselem mee ka a nụ olu ya;+ ala ịta ahịhịa nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru uju, elu elu ugwu Kamel ga-akpọkwa nkụ.”+