18 Mụ na anụ ọhịa+ na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ n’ala ga-agba ndụ n’ụbọchị ahụ n’ihi ha, m ga-emekwa ka ụta na mma agha na agha ghara ịdịkwa n’ala ha,+ m ga-emekwa ka ha dinara ala n’obi iru ala.+
10 M ga-ebipụ ụgbọ ịnyịnya agha n’Ifrem, bipụkwa ịnyịnya na Jeruselem.+ A ga-ebibikwa ụta agha.+ Ọ ga-agwa mba dị iche iche okwu udo;+ ọchịchị ya ga-esi n’oké osimiri ruo n’oké osimiri, sikwa n’osimiri Yufretis ruo na nsọtụ ụwa.+