3 Ọ bụ ya mere úkwù ji na-egbu m mgbu nke ukwuu.+ Anọ m n’ihe mgbu, dị ka ihe mgbu nke nwaanyị na-amụ nwa.+ Obi erughị m ala, n’ihi ya anaghị m anụ ihe; uche akpaghasịwo m, n’ihi ya anaghị m ahụ ụzọ.
6 Jụọnụ ajụjụ, chọpụtakwanụ ma nwoke ọ̀ na-amụ nwa. Gịnị mere m ji hụ ka nwoke ọ bụla gbanyere aka n’úkwù ka nwaanyị na-amụ nwa,+ ihu niile agbarụọkwa agbarụ?+