4 Ìgwè ihe niile dị n’eluigwe ga-erekasị.+ A ga-afụkọta eluigwe+ dị ka akwụkwọ mpịakọta; ihe niile dị na ya ga-akpọnwụ, dị ka akwụkwọ osisi vaịn si akpọnwụ wee dapụ, dịkwa ka mkpụrụ vaịn fịkpọrọ afịkpọ nke si n’osisi fig dapụ.+
16 Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ, ọ ga-emekwa ka olu ya+ si na Jeruselem kwuo okwu. Eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ;+ ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba,+ ọ ga-abụkwara ụmụ Izrel ebe e wusiri ike.+
26 N’oge ahụ, olu ya mere ka ụwa maa jijiji,+ ma ugbu a, o kwewo nkwa, sị: “Ọ ka fọrọ otu ugboro m ga-eme ka ọgba aghara dị, ọ bụghị naanị n’ụwa kamakwa n’eluigwe.”+