12 Ọtụtụ n’ime ndị nchụàjà+ na ndị Livaị na ndị isi nke ọnụmara dị iche iche,+ ndị agadi bụ́ ndị hụrụ ụlọ mbụ ahụ,+ nọ na-akwa ákwá+ n’olu dara ụda mgbe a na-atọ ntọala+ ụlọ a n’ihu ha, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ.+
3 ‘Ònye n’ime unu bụ́ ndị fọdụrụ afọdụ hụrụ ụlọ a n’ebube ya mbụ?+ Oleekwa otú ọ dị unu n’anya ugbu a? N’anya+ unu, ọ́ dịghị ka ihe na-abụghị ihe ọ bụla ma e were ya tụnyere nke ahụ?’