28 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka m mụ anya n’ebe ha nọ+ ifopụ ha, kwatuo ha, tida ha, laa ha n’iyi, bibiekwa ha,+ otú ahụ ka m ga-amụ anya n’ebe ha nọ iwulite ha, kụọkwa ha dị ka mkpụrụ,”+ ka Jehova kwuru.
7 Malite n’ụbọchị ndị nna nna unu, unu agbakụtawo ụkpụrụ m azụ, unu adịghịkwa edebe ha.+ Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.