11 “‘N’ihi na mụ onwe m maara nke ọma ihe m na-echere unu,’+ ka Jehova kwuru, ‘echiche udo, ọ bụghị nke ọdachi,+ ime ka unu nwee ọdịnihu na olileanya.+
42 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Dị nnọọ ka m meworo ka oké ọdachi a dum dakwasị ndị a, otú ahụ ka m ga-eme ka ihe ọma niile m na-ekwu banyere ha mezuoro ha.+
10 Nọrọ n’oké ihe mgbu, gị ada bụ́ Zayọn, dị ka nwaanyị nke na-amụ nwa,+ n’ihi na ị ga-esi n’obodo pụọ, ị ga-ebikwa n’ọhịa.+ Ị ga-erukwa Babịlọn.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka a ga-anapụta gị.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova ga-agbapụta gị n’aka ndị iro gị.+