36 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke, kanyekwa na ya, ‘Ịdị nsọ bụ nke Jehova,’ dị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara.+
30 N’ikpeazụ, ha ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke, ihe àmà dị nsọ nke nraranye ma kanye ihe n’elu ya dị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara: “Ịdị nsọ bụ nke Jehova.”+
8 Okporo ụzọ ga-adị n’ebe ahụ,+ ee, ụzọ ga-adị; a ga na-akpọ ya Ụzọ nke Ịdị Nsọ.+ Onye na-adịghị ọcha agaghị esi na ya gafee.+ Ọ ga-abụ maka onye na-eje ije n’ụzọ ahụ, ọ dịghịkwa ndị nzuzu ga-awagharị na ya.