30 N’ikpeazụ, ha ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke, ihe àmà dị nsọ nke nraranye ma kanye ihe n’elu ya dị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara: “Ịdị nsọ bụ nke Jehova.”+
9 O wee kee ya ákwà a na-eke n’isi+ n’isi ma tinye n’ihu ákwà ahụ a na-eke n’isi mbadamba ihe na-egbuke egbuke nke e ji ọlaedo mee, bụ́ ihe àmà dị nsọ nke nraranye,+ dị ka Jehova nyere Mozis n’iwu.
20 “N’ụbọchị ahụ, a ga-ede+ n’elu mgbịrịgba nke ịnyịnya nya n’olu, sị, ‘Ịdị Nsọ bụ nke Jehova!’+ Ite e ji esi nri ndị nwere ọnụ obosara,+ bụ́ ndị dị n’ụlọ Jehova, ga-adị ka ọkwá+ n’ihu ebe ịchụàjà.+
26 N’ihi na ụdị nnukwu onye nchụàjà a kwesịrị anyị,+ onye na-eguzosi ike n’ihe,+ onye na-adịghị aghụghọ,+ onye a na-emerụghị emerụ,+ onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ,+ o wee dị elu karịa eluigwe.+